Friday, 25 October 2013

(IN IGBO) fraidee, oktoba 25 RHAPSODY OF REALITIES

Aha Ịtụnanya Ya ·

pastọ chris

Jizọs a bịakwa gwa ha okwu sị, E nyefeela ike niile dị n’eluigwe na n’eluụwa n‘aka m. Nihi ya Gaa nụ, kụziekwara mba niile ihe, na e me ha baptizm n’aha ahụ bụ nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: Na a kụziri ha ime ihe niile ọbụla nke M nyerela ụnụ n’iwu (Matiu 28:18-20).
Pastor Chris Ọbụrụna a mụọla gị ọzọ, a kpọọla Aha Jizọs n’isi gị. Aha ahụ bụ aha kachasị uku nke e kpugherela nye mmadụ, nihina ya bụ Aha Chineke sitere n’aka Ya kee ihe niile. Chineke tinyere ikikere niile nime Aha ịtụnanya ahụ, Aha e nweghị atụtụ nke Jizọs Kraịst. Okwu ahụ kwuwara na Jizọs ranyere ikikere Ya n’aka anyị, ziekwa anyị ka anyị ji Aha Ya mee ka mba niile bụrụ ndị nsonazụ Ya. O kwuru sị, "…na e me ha baptizm n’Aha ahụ bụ nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ." O kwuru "Aha," dịka okwu aha dị na nge si otua na e zi anyị na Nna, Ọkpara na Mmụọ Nsọ nwere otu Aha nke bụ Jizọs. Mgbe ị na a mụ ọmụmụihe n’akwụkwọ Ọlụ NdịOzi, ị ga a chọpụta na NdịOzi ahụ, n’ime ihe Nnauku nyere dịka ntụziaka, ha mere baptizm n’Aha Jizọs (Ọlụ NdịOzi 2:38, 8:16, 10:48, 19:5, 22:16). Ha ghọtara ụka Jizọs kwuru n’e nweghị ngwọju-anya ọbụla. Ha maara n’ Aha "Jizọs" bụ Aha nke ịbụ-isi nke Chineke! Mgbe i kwuru "N’Aha Jizọs," ị na e kwu banyere ịbụ Chineke. Ndị Kọlọsi 1:19 kwuru sị, "Nihina ọ masịrị Nna na njupụta niile ga e bi nime Ya (Jizọs)." Njupụta nke ịbụ- isi nke Chineke bi nime Jizọs n’ọdịdị nke anụarụ—Aha dị elu karịa aha niile. Kwe ka Aha Jizọs na e nye gị ọñụ! Ndị Filipaị 2:10 kwuru sị "…ihe niile ga na e gbu ikpere n’ala nye Aha Jizọs, bụ ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’eluụwa na ihe ndị dị n’okpuru eluụwa." Ihe niile na ihe ọbụla nwere ọbụbụ nime eluigwe, n’eluụwa mọọbụ n’okpuru eluụwa ka e doro n’okpuru Jizọs. Ekpere
Ezigbo Nna, e kelee m gị maka inye m ikikere maka ịrụ ọrụ n’Aha Jizọs! A na m e bi ndụ taata site n’ike nke Aha ahụ, n’ike ọchịchị, mmeri na eziomume. A na m a hụta udo, ọganiru, mbawanye, ihe ngazi na ịba ọgaranya mgbe dum, n’Aha Jizọs. Amịm.
IHE MMỤTA :Luke 10:19; Ndị Filipaị 2:9-11

Agụgu Akwukwọ Nsọ

Atụmatụ ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n&rsquo : Aịsaịa 64-66 II. Tịmọtị 1:1-18
Atụmatụ ọgụgụ Akwụkwọ Ns : Jọn 7:32-44 II. Ndi-eze 13-14

No comments:

Post a Comment