Thursday, 24 October 2013

(IN IGBO LANG) RHAPSODY OF REALITIES. tọọzdee, oktoba 24

Nime Ya, Ị Nọ na Ndokwa! ·

Ọ bụ onye mgbapụta bụrụkwa onye nnapụta, ọ na a rụ ihe ịrịbaama na ọrụ ịtụnanya n’eluigwe na n’eluụwa, onye ahụ nke gbapụtarala Daniel n’aka nke ike ọdụm (Daniel 6:27).
Pastor Anita pastọ anita
 Onyenwe anyị bụ onye mgbapụta na onye nnapụta; Ọ na a gbapụta onye eziomume n’aka nsogbu napụtakwa ya n’aka ịla niyi. AbụỌma 59:16 kwuru sị, "Kama m ga a bụ abụ maka ike gị; ee, m ga e ji olu siri ike bụọ abụ maka ebere gị n’ụtụtụ: nihina ị bụrụla onye nchedo nye m bụrụkwa ebe mgbaba m n’ụbọchị nke nsogbu m." Ọ bụ ebe nke nchedo. Ọbụrụna a mụọla gị ọzọ, ị nọ nime Ya; e zokwara ndụ gị n’aka Kraịst nime Chineke (Ndị Kọlọsi 3:3). Kraịst bụ nchedo gị, nnapụta gị na ebe e wusiri ike nke gị. Ọbụghị ihe ịtụnanya n’Ọ gwara anyị ọtụtụ oge nime Okwu ahụ sị, "a tụna ụjọ."
Onye mọọbụ ihe na e bilite imegide gị a gbanwoghi ihe ọbụla; Onyenwe anyị kwuru sị "A tụna ụjọ." E kwena ka onye mmegide ahụ mee ka ị tụọ nnuku egwu, obi e luna gị nihi ụzọ e siri kọwaa ya. Nọsie ike nime Onyenwe anyị, na nime ike nke ịdị uku Ya (Ndị Efesọs 6:10). Ị nọghị naanị gị. Baịbụl kwuru na Ndị Hibru 12:22 sị, "Kama ụnụ a bịaruola n’Ugwu Sayọn, bịaruokwa n’obodo nke Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe, bịakutekwa oke igwe ndị mmụọ-ozi a pụghị ịgụ ọnụ…." Ndị mmụọ-ozi gbara gị gburugburu, dịka Baịbụl kwuru, ndị e nyere ọrụ banyere gị, ka ha dobe gị, ya bụ, chekwa gị n’ụzọ gị niile (AbụỌma 91:11).
1 Jọn 4:4 kwuru sị, "Ụnụ bụ nke Chineke, ụmụ ntakịrị, ụnụ e meriekwala ha: nihina onye ahụ nke nọ nime ụnụ dị uku karịa onye ahụ nke nọ nime ụwa." I merielarị onye iro ahụ. E tinyena uche gị na nkọru-akụkọ dị ichiiche nke na e me ka onyeiro ahụ yie ihe siri ike. Otu ahụ ka ụjọ si e wulite werekwa ọnọdụ. Karịa otua, were okwu nke okwukwe wusie mmụọ gị ike. Nọgide n’ịnụrụ okwu dị ichiiche ndị jupụtara n’okwukwe, ruo mgbe ọ bụrụ ihe e kweghi omume n’ị ga e kwu okwu mọọbụ chee uche nke ụjọ.
Nara Okwu Chineke na e kwuru gị taata; were obiike kwuwaa na Kraịst bụ ebe mgbaba gị na ike gị! Nime Ya ka ị na e bi, na e jegharị nakwa e nweta ọbụbụ gị; nihi ya ọdịghị ihe ọjọọ ọbụla nke pụrụ ịdakwasị gị! AbụỌma 91:7 kwuru sị, "Pụkụ ga a da n’akụkụ gị, puku iri kwa n’aka akanri gị; kama ọ gaghị e rute nso ebe ị nọ." I bi nime Ya; nihi ya, e si n’eluigwe chekwa chedokwa gị n’aka nsogbu, n’aka ịbụ onye e meriri emeri, ọdịda na ọnwụ. "Ị gaghị a tụ ụjọ maka oke iyi egwu n’oge abalị; mọọbụ tụọ ụjọ maka ụta na e fegharị n’ehihè" (AbụỌma 91:5).
Nkwupụta
E kwuwaa m mmeri m na ebube m nime Kraịst Jizọs. M na e jegharị nime amamihe Ya, na n’ike ọchịchị nke Mmụọ Nsọ taata; nihina onye ahụ nke nọ nime m dị uku karịa onye ahụ nke nọ nime ụwa. A bụ m karịa onye ndọta n’agha.
IHE MMỤTA :AbụỌma 32:7; AbụỌma 91:1-16

Agụgu Akwukwọ Nsọ

Atụmatụ ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n&rsquo : I. Tịmọtị 6:1-21 Aịsaịa 61-63
Atụmatụ ọgụgụ Akwụkwọ Ns : Jọn 7:20-31 II. Ndi-eze 11-12

No comments:

Post a Comment